Judges 7:16-20

16O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya.

17Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere. 18Mgbe ọbụla mụ na ndị so m nʼazụ fụrụ opi ike anyị, unu niile ga-afụkwa opi ike unu nʼakụkụ ọbụla unu nọ, tie mkpu, sị, ‘Anyị dịnyere Onyenwe anyị, dịnyekwara Gidiọn.’ ”

19Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche. 20Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”
Copyright information for IboBIU